Richard Phillips Feynman (/ˈfaɪnmən/; 11 Ọnwaìse 1918 – 15 Ọnwaàbụọ 1988) bụ̀rụ̀ onye Amẹrika ǹkè ọ̀mụ̀ntụdị ǹrùrò kà ha mà màkà ọrụ ya nà ụzọ mbaramkpà ǹkè mpịamara ǹkè òrèjè ụ̀hàmà, ịhẹ ǹrùò ndụọkụntụmụ̀nyo ụ̀hàmà, nà ọ̀mụ̀ntụdị ǹkè okeǹrùrù ǹkè okenjuchaoyi èrù umeanyaanwụ, nàkwà nà ọ̀mụ̀ntụdị nkịrịnkịrị ǹkè o tụ̀nyèrè uchè màkààtụ̀ nkịrịtụ. Màkà ọrụ ya nà mmepụ̀ta ǹkè ndụọkụntụmụ̀nyo ụ̀hàmà, Feynman, nà Julian Schwinger mà Shin'ichirō Tomonaga, gonwètàràngo Nobel nà ọ̀mụ̀ntụdị nà afọ̀ 1965.
Feynman mepụ̀tàrà ọrụzù òsìse nnọ̀chie ịhẹ ọ̀tụtụ madụ̀ nà è ji màkà mmepụ̀ta agụ̀mà katara àgwà akụmmìmì nkịrịnkịrị, ǹke mechara nweta ahà bụrụ akàmì Feynman. N'ogè â nà ndụ̀, Feynman à bụzie otù diamụ̀mà ọ̀kàka ha mà n'ụ̀wà. Nà njutụ̀ama ǹkè afọ̀ 1999 ǹkè 130 ndi odudu bụrụ diọ̀mụ̀ntụdị nà ụ̀wà gbùrù gburù si nà aka ịhẹ ndedaBritish Physics World, ha dòrò ya n'isi kà otù onye nà madụ̀ ìri kara ị me ọrụ diọ̀mụ̀ntụdị nà ogè níle.
O nyèrè aka nà nrụpụ̀ta nkpọ akụm n'ogèagha ụ̀wà II nà ahà ya è wuzi nà afọ̀ìri 1980, 1980 kà onye òtù ndịìzùnrụpụ̀ta Rogers, ndị ìzùọkwa ǹke nyòchàrà m̀bèrèdeọ̀kwọga m̀baraChallenger. Soro ọrụ ya nà ime ọ̀mụ̀ntụdị ǹrùrò, ha tụrụ Feynman aka kà onye nwaraụzọ̀ nà ọ̀gbọ ǹkè ọ̀màzù ụ̀hàmà nà idubàtà ịhẹ uchepụ̀ta bụrụ ọ̀kàkị̀rị̀. O jìrì ọkammụ̀ta ǹkè Richard C. Tolman nà ọ̀mụmụ ọ̀mụ̀ntụdị ǹrùrò nàùzùmụ̀tà California ǹkè ǹkàpụ̀tà.